Psalms 121

Abụ nrigo.

Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

1Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,
olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
2Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, a
onye kere eluigwe na ụwa bịa.

3Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,
onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
4nʼezie onye na-eche Izrel nche
adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.

5 Onyenwe anyị na-eche gị nche,
Onyenwe anyị bụ ndo b gị nʼaka nri gị;
6anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,
ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.
Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,
site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU